1 Onye ọbụla na-ahụ ịdọ aka na ntị nʼanya na-ahụ ihe ọmụma nʼanya,
2 Ezi mmadụ na-anata ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị,
3 Onye ajọ omume agaghị anọgide,
4 Ezi nwanyị bụ ọṅụ na okpueze di ya,
5 Echiche obi niile nke onye ezi omume bụ ihe ziri ezi,
6 Okwu niile nke ndị ajọ omume bụ ihe na-eweta ọnwụ,
7 Ndị na-emebi iwu ga-ala nʼiyi,
8 Onye nwere uche zuruoke ka mmadụ niile na-achọ,
9 Ọ ka mma ịbụ onye a na-elelị anya ma i nwere ohu,
10 Onye ezi omume na-elekọta anụ ụlọ ya,
11 Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba,
12 Ndị ajọ omume na-enwekwa anya ukwu nʼihe ndị ajọ omume ibe ha nwere,
13 A na-ejide onye ajọ omume site nʼokwu ọnụ ya,
14 Ikwu eziokwu na-enye mmadụ obi ụtọ,
15 Ụzọ ndị nzuzu nʼuche ha onwe ha ziri ezi,
16 Ndị nzuzu na-egosipụta iwe ha ọsịịsọ,
17 Ezi onye akaebe na-ekwu eziokwu,
18 Okwu ọjọọ na-agbawa obi dịka mma agha,
19 Eziokwu na-eguzo ruo mgbe ebighị ebi,
20 Aghụghọ na-ejupụta nʼobi na-eche ihe ọjọọ;
21 Ihe ọjọọ anaghị adakwasị onye ezi omume,
22 Onyenwe anyị kpọrọ egbugbere ọnụ nʼagha ụgha asị,
23 Onye nwere uche na-edebe ihe ọmụma ha nye onwe ha,
24 Aka na-arụsị ọrụ ike ga-achị achị,
25 Obi nke jupụtara na nchegbu na-ada mba,
26 Onye ezi omume na-eduzi onye agbataobi ya,
27 Onye umengwụ adịghị ahụ anụ ọ chụtara na nta nʼọkụ,
28 Ụzọ nke onye ezi omume na-eduba na ndụ,