1 “Gwa ụmụnne gị ndị nwoke Ami, ‘nke pụtara ndị m,’ gwakwa ụmụnne gị nwanyị Ruhama, nke pụtara, ‘Unu ndị m hụrụ nʼanya.’
2 “Unu guzogidenụ nne unu, rịọọnụ ya,
3 Ma ọ bụghị otu a, aga m eyipụ ya uwe ya mee ka ọ gbara ọtọ,
4 Agaghị m egosi ụmụ ya ebere m,
5 Nʼihi na nne ha bụ onye na-akwa iko,
6 Nʼihi nke a, aga m eji ogwu na uke gbachie ya gburugburu;
7 Ọ ga-agbaso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya ma ọ gaghị achụkwute ha.
8 Ma ọ kwetaghị na ihe ndị a si nʼaka m,
9 “Ya mere, aga m ewerekwa ọka m mgbe ọ chara,
10 Ugbu a, aga m ekpughe ọtọ ya
11 Aga m eme ka obi ụtọ ya kwụsị;
12 Aga m ala ubi vaịnị ya na osisi fiig ya niile nʼiyi,
13 Aga m enye ya ahụhụ maka ụbọchị niile
14 “Nʼihi nke a, aga m arara ya,
15 Ebe ahụ ka m ga-enyeghachi ya ubi vaịnị ya,
16 “Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
17 Nʼihi na aga m ewepụkwa aha niile nke arụsị Baal nʼegbugbere ọnụ ya,
18 Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka gị na ụmụ anụ ọhịa gbaa ndụ,
19 Aga m ekwerekwa ịlụ gị dịka nwunye ruo ebighị ebi;
20 Aga m eji ikwesi ntụkwasị obi kwere ịlụ gị.
21 “Nʼụbọchị ahụ m ga-azaghachi,”
22 Ala ga-azaghachi ọka
23 Aga m akụkwa ya nye onwe m nʼala ahụ dịka mkpụrụ.