Números 26

IBO

1 Mgbe ihe otiti ahụ niile gasịrị, Onyenwe anyị gwara Mosis na Elieza nwa Erọn, onye nchụaja okwu sị ha,

2 “Gaanụ gụọ, chọpụta ọnụọgụgụ nzukọ niile nke ụmụ Izrel dịka ezinaụlọ ha si dị; ndị niile gbara iri afọ abụọ gafee. Chọpụta ọnụọgụgụ ndị nwere ike ije agha.”

3 Ya mere, na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu Jeriko, ka Mosis na Elieza onye nchụaja nọ gwa ha okwu sị ha,

4 “Gụọnụ ndị ikom gbara iri afọ abụọ gafee ọnụ, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.”

5 Ụmụ ụmụ Ruben, ọkpara Izrel, bụ ndị a:

6 site na Hezrọn, ikwu Hezrọn

7 Ndị a bụ agbụrụ Ruben. Ọnụọgụgụ ha dị iri puku anọ, puku atọ na narị asaa na iri atọ (43,730).

8 Nwa Palu bụ Eliab,

9 ụmụ Eliab bụ Nemuel, Datan na Abiram. Datan na Abiram bụ ndị ndu ọgbakọ ahụ nupuru isi megide Mosis na Erọn. Ha sonyere ndị ahụ so Kora mgbe ha nupuru isi megide Onyenwe anyị.

10 Ala meghere ọnụ ya, loo ha na Kora, ma ọkụ rechapụrụ narị mmadụ abụọ na iri ise ndị ọzọ ahụ sonyere ha. Ọnwụ ha ghọrọ ihe ịdọ aka na ntị.

11 Otu ọ dị, ndị niile si nʼezinaụlọ Kora anwụchaghị.

12 Ụmụ ụmụ Simiọn dịka ikwu ha si dị bụ,

13 Site na Zera, ikwu Zera,

14 Ndị a bụ ndị agbụrụ Simiọn. Ọnụọgụgụ ndị ikom ha dị iri puku abụọ, puku abụọ na narị abụọ (22,200).

15 Ụmụ ụmụ Gad dịka ikwu ha si dị bụ ndị a:

16 ikwu Ozni, site na Ozni,

17 ikwu Arodi, site na Arodi,

18 Ndị a bụ agbụrụ Gad. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku anọ na narị ise (40,500).

19 Ụmụ ndị ikom Juda abụọ, Ịa na Onan, nwụrụ nʼala Kenan.

20 Ma ụmụ ụmụ Juda ndị ọzọ, dịka ikwu ha dị iche iche si dị bụ ndị a:

21 Ikwu abụọ ọzọ si nʼagbụrụ Perez bụ ndị a:

22 Ndị a bụ agbụrụ Juda. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku asaa, puku isii na narị ise (76,500).

23 Ụmụ ụmụ Isaka dịka ikwu ha si dị bụ ndị a:

24 ikwu Jashub, site na Jashub,

25 Ndị a bụ agbụrụ Isaka. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku isii, puku anọ na narị atọ (64,300).

26 Ụmụ ụmụ Zebụlọn dịka ikwu ha si dị bụ ndị a:

27 Ndị a bụ agbụrụ Zebụlọn. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku isii na narị ise (60,500).

28 Ụmụ ụmụ Josef dịka ha si dị nʼagbụrụ Manase na Ifrem bụ ndị a:

29 Ụmụ ụmụ Manase bụ ndị a:

30 Ndị a bụ ụmụ ụmụ Gilead:

31 Ikwu Asriel, site na Asriel.

32 Ikwu Shemida, site na Shemida,

33 (Hefa mụtara nwoke a na-akpọ Zelofehad. Ma Zelofehad amụtaghị nwoke ọbụla kama ndị inyom ndị a ka ọ mụtara, Mahla, na Noa, na Hogla, na Milka, na Tịaza.)

34 Ndị a bụ agbụrụ Manase. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku ise, puku abụọ na narị asaa (52,700).

35 Ndị a bụ ụmụ ụmụ Ifrem dịka ikwu ha si dị:

36 Ndị a bụ ụmụ ụmụ Shutela:

37 Ndị a bụ agbụrụ Ifrem. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku atọ, puku abụọ na narị ise (32,500).

38 Ndị a bụ ụmụ ụmụ Benjamin dịka ikwu ha si dị:

39 Ikwu Shufam site na Shufam,

40 Ụmụ ụmụ Bela site na Aad, na Naaman bụ,

41 Ndị a bụ agbụrụ Benjamin. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku anọ, puku ise na narị isii (45,600).

42 Ụmụ ụmụ Dan dịka ikwu ha si dị bụ ndị a:

43 Ha niile si nʼagbụrụ Shuham. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku isii, puku anọ na narị anọ (64,400).

44 Ụmụ ụmụ Asha dịka ikwu ha si dị bụ ndị a:

45 Ikwu e nwere site nʼụmụ ụmụ Beriya bụ ndị a:

46 Asha mụtakwara otu nwa nwanyị aha ya bụ Sera.

47 Ndị a bụ agbụrụ Asha. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ (53,400).

48 Ụmụ ụmụ Naftalị dịka ikwu ha si dị bụ ndị a:

49 ikwu Jeza, site na Jeza,

50 Ndị a si nʼagbụrụ Naftalị. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku anọ, puku ise na narị anọ (45,400).

51 Ya mere, ọnụọgụgụ ndị ikom niile tozuru ije agha nʼIzrel dị narị puku isii, otu puku na narị asaa, na iri atọ (601,730).

52 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,

53 “Ị ga-ekenye ha ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa ha dịka ọnụọgụgụ aha ha si dị.

54 Ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ ga-eketa ala dị ukwuu, ma ndị dị nta ga-eketa ala dị nta. Ihe nketa nke onye ọbụla ga-enweta ga-adị ka ọnụọgụgụ ahụ e dere.

55 Lezie anya hụ na e kesara ala ahụ site nʼife nza. Ala ndị ọbụla ga-eketa ga-abụ dịka aha nna ochie ebo ha si dị.

56 A ga-esite nʼife nza kenye ndị ọbụla ihe nketa nke ha dịka ịdị ukwuu maọbụ ịdị nta ha si dị.”

57 Ndị a bụ ndị Livayị a gụrụ ọnụ dịka ikwu ha si dị,

58 Ndị a sikwa nʼagbụrụ Livayị:

59 Aha nwunye Amram bụ Jekobed, nwa nwa Livayị, onye a mụrụ nʼagbụrụ ndị Livayị nʼIjipt. Ọ mụtaara Amram ụmụ ndị a: Erọn na Mosis, na Miriam, nwanne ha nwanyị.

60 Erọn mụtara Nadab, na Abihu, na Elieza, na Itama.

61 Ma Nadab na Abihu nwụrụ mgbe ha chere ọkụ na-adịghị nsọ nʼihu Onyenwe anyị.)

62 Ọnụọgụgụ ụmụ ndị ikom Livayị niile dị otu ọnwa gaa nʼihu dị iri puku abụọ na puku atọ (23,000). Ma a gụnyekọghị ọnụọgụgụ agbụrụ Livayị nʼọnụọgụgụ ndị Izrel, nʼihi na agbụrụ Livayị enweghị oke ọbụla mgbe e kenyere agbụrụ Izrel niile ihe nketa ha.

63 Ya mere, ndị a bụ nchọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Izrel, dịka Mosis na Elieza onye nchụaja kwadobere gụọ na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu obodo Jeriko.

64 Ma nʼetiti ndị a, o nweghị otu onye ọbụla Mosis na Erọn onye nchụaja gụrụ nʼọnụọgụgụ mgbe ha gụrụ ndị Izrel ọnụ nʼọzara Saịnaị.

65 Nʼihi na Onyenwe anyị gwara ndị Izrel ahụ na ha ga-anwụ nʼime ọzara ahụ. Naanị ndị a hapụrụ ndụ bụ Kaleb, nwa Jefune, na Joshua nwa Nun.

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado