1 Onyenwe anyị, biko, cheta ihe niile dakwasịrị anyị;
2 E werela ihe nketa anyị nyefee ndị ọbịa nʼaka,
3 Anyị aghọọla ụmụ mgbei, na ndị na-enweghị nna.
4 Anyị na-akwụ ụgwọ nʼihi mmiri anyị na-aṅụ.
5 Agbanyeghị na anyị nya yoku nʼolu, anyị bụ ndị a na-adọgbu nʼọrụ,
6 Anyị weere onwe anyị nyefee ndị Ijipt na ndị Asịrịa nʼaka
7 Nna anyị ha mehiere, ma ha anwụọla.
8 Ndị bụ ohu na-achị anyị.
9 Anyị ji ndụ anyị nʼaka mgbe anyị na-achọ inweta ihe anyị ga-eri,
10 Anụ ahụ anyị dị ọkụ dịka ite ọkụ,
11 Emerụọla ndị inyom dị na Zayọn,
12 Akwụgbuola ụmụ eze site nʼikegide aka ha nʼelu;
13 Ụmụ okorobịa na-adọgbu onwe ha nʼọrụ na nkume ịkwọ nri,
14 Ndị okenye adịghịkwa anọ nʼọnụ ụzọ ama,
15 Ọṅụ adịghịkwa nʼobi anyị;
16 Okpueze esitela nʼisi anyị dapụ.
17 Nʼihi nke a, obi anyị na-ada mba,
18 Nʼihi ugwu Zayọn nke tọgbọrọ nʼefu,
19 Gị, Onyenwe anyị, na-abụ eze ruo mgbe ebighị ebi.
20 Gịnị mere i ji na-echezọ anyị kpamkpam?
21 Mee ka anyị lọghachikwute gị, Onyenwe anyị, ka anyị si otu a lọtakwa;
22 ma ọ bụghị na ị jụla anyị kpamkpam