1 Ndị a bụ okwu Onyenwe anyị, nke ruru Jeremaya onye amụma ntị, banyere mba dị iche iche.
2 Nke dịrị Ijipt:
3 “Kwadoonụ ọta agha unu, ndị ukwu na ndị nta,
4 Kegidezienụ ịnyịnya unu,
5 Gịnị ka anya m abụọ hụrụ?
6 “Ndị nwere ụkwụ ọsọ enweghị ike ịgbalaga,
7 “Onye bụ onye a, nke na-ebili ọtọ dịka osimiri Naịl,
8 Ijipt na-ebili elu dịka osimiri Naịl,
9 Gbabanyenụ nʼọgbọ agha, unu ịnyịnya niile.
10 Ma ụbọchị ahụ dịrị Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
11 “Rigoro Gilead ka i weta mmanụ a na-ete nʼọnya,
12 Mba niile ga-anụ akụkọ ihe ihere bịakwasịrị gị.
13 Okwu ndị a ka Onyenwe anyị gwara Jeremaya onye amụma, banyere ọbịbịa nke Nebukadneza, bụ eze Babilọn, onye na-abịa ibuso Ijipt agha.
14 “Kwupụtanụ ihe ndị a nʼIjipt. Kwusaa ya na Migdol.
15 Gịnị mere a ga-eji gbudasịa ndị gị niile bụ dike nʼagha?
16 Ha ga-asọ ngọngọ mgbe mgbe,
17 Nʼebe ahụ ka ha ga-anọ tie mkpu sị,
18 “Dịka mụ onwe m na-adị ndụ,” ka Eze ahụ kwupụtara,
19 Kwakọtaanụ ngwongwo unu, jikerenụ maka ije biri nʼala ọzọ,
20 “Ijipt mara mma dịka nne ehi,
21 Ndị agha e goro ego nọ nʼetiti ha
22 Ijipt ga-eme mkpọtụ, dịka mkpọtụ nke agwọ na-agba ọsọ na-eme,
23 Ha ga-egbutu oke ọhịa ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
24 A ga-eme ka ihere mee Ada Ijipt,
25 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, sịrị, “Ana m aga ime ka ahụhụ bịakwasị Amọn, bụ chi ndị Tibs, na Fero, na ala Ijipt na chi niile dị nʼime ya, ndị eze ya niile nakwa ndị ahụ na-atụkwasị Fero obi.
26 Aga m enyefe ha nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ ha ike, bụ Nebukadneza eze Babilọn, na ndịisi ọchịchị ya. Ma nʼikpeazụ, aga m emekwa ka ndị mmadụ birikwa nʼime ya ọzọ, dịka e si biri nʼime ya na mgbe ochie.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
27 “Atụla egwu, gị Jekọb, ohu m.
28 Atụla egwu, gị Jekọb, ohu m,