1 “Ahụhụ dịrị ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-achụsasị, ma na-ebibi igwe atụrụ m ha kwesiri ilekọtazi anya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
2 Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-agwa ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-elekọta ndị m, “Ebe ọ bụ na unu akpasasịala igwe ewu na atụrụ m, chụsaa ha, kama ilekọtazi ha anya nke ọma, aga m ata unu ahụhụ nʼihi ihe ọjọọ ndị a unu mere.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
3 “Mụ onwe m ga-eji aka m chịkọta ndị m fọdụrụ nʼigwe ewu na atụrụ m site na mba ahụ niile m chụgara ha, kpọghachikwa ha nʼebe ịta nri ha, ebe ha ga-anọ mụbaa, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ.
4 Aga m ahọpụtakwa ndị ọzụzụ atụrụ, ndị ga-elekọtazi ha anya. Egwu agaghị atụ ha, ọ dịkwaghị onye ga-emenye ha ụjọ. O nwekwaghị onye ga-akpafu akpafu nʼime ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
5 “Ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,
6 Nʼụbọchị, ya ka a ga-azọpụta Juda,
7 “Nʼihi nke a, ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe ndị mmadụ na-agaghị asịkwa ọzọ, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye sitere nʼala Ijipt dupụta ndị Izrel,’
8 ma ha ga-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ kpọlatara agbụrụ Izrel site nʼala dị nʼugwu, na mba dị iche iche ebe ọ chụgara ha.’ Mgbe ahụ, ha ga-ebi nʼala nke aka ha.”
9 Ma banyere ndị amụma,
10 Ndị jupụtara nʼala a bụ ndị na-akwa iko.
11 “Nʼihi na ndị amụma na ndị nchụaja aghọọla ndị na-amaghị Chineke.
12 “Nʼihi ya, ụzọ ha na-agbaso ga-adị ka ebe na-amị amị;
13 “Ahụrụ m ihe arụ
14 Ahụkwara m ihe jọgburu onwe ya
15 Nʼihi nke a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru banyere ndị amụma a,
16 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
17 Ha na-anọgide na-agwa ndị ahụ na-elelị m anya na-asị ha,
18 Ma olee onye ọ bụ nʼetiti ndị amụma a nke na-abịaru Onyenwe anyị nso,
19 Lee, Onyenwe anyị na-ezite oke ifufe na-efesi ike,
20 Onyenwe anyị agaghị akwụsị iwe iwe ya
21 Ọ bụghị m zitere ndị amụma a,
22 A sị na ha abịala nso guzo nʼebe ịgba izu nzuzo m,
23 “Abụ m naanị Chineke na-anọ ha nso,
24 “O nwere onye pụrụ izo onwe ya nʼebe nzuzo
25 “Anụla m ka ndị amụma a, bụ ndị na-ebu amụma ụgha nʼaha m na-ekwu na-asị, ‘Arọrọ m nrọ! Arọrọ m nrọ!’
26 Ruo ole mgbe ka ihe dị otu a ga-adịgide nʼobi ndị amụma ndị a, ndị na-ebu amụma aghụghọ dị ha nʼobi?
27 Ha na-eche na nrọ ha na-akọrịtara ibe ha ga-eme ka ndị mmadụ chezọọ aha m, dịka ndị nna nna ha si chezọọ aha m site nʼịkpọ isiala nye Baal.
28 Ka onye amụma ahụ rọrọ nrọ kọgharịa nro ọ rọrọ. Otu a kwa, ka onye ahụ okwu m dị nʼọnụ ya nọgidekwa na-ekwusa ya nʼeziokwu. Nʼihi na gịnị ka okporo ọka na mkpụrụ ọka nwekọrọ?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
29 “Okwu m ọ dịghị ka ọkụ? Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, Okwu m ọ dịkwaghị ka okporo igwe nke na-etiwasị nkume?”
30 Nʼihi ya, Onyenwe anyị kwubiri sị, “Ana m edo onwe m megide ndị amụma na-esite nʼọnụ ibe ha na-ezute okwu ha na-ekwu, ma na-asị na ọ bụ nʼọnụ m ka ha si nata ya.
31 E, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, Ana m edo onwe m megide ndị amụma ahụ ire ha na-ekwu ọtụtụ okwu, ndị ahụ na-asịkwa, ‘Ọ bụ ihe si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta.’
32 Nʼezie, ana m edo onwe m megide ndị ahụ niile na-ebu amụma nro ụgha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ha ji okwu ụgha ha na-agwa ndị m okwu, na-eduhie ha, ma ọ bụghị m họpụtara ha. Ọ bụkwaghị m zitere ha. Okwu ha adịghịkwa abara ndị m uru ọbụla.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
33 “Mgbe ndị a, maọbụ ndị amụma ha, maọbụ ndị nchụaja ha, jụrụ gị ajụjụ sị gị, ‘Gịnị bụ ozi i si nʼọnụ Onyenwe anyị nata?’ Ị ga-asa ha sị, ‘Ozi nke ole? Aga m agbakụta unu azụ, ya bụ ihe Onyenwe anyị kwubiri.’
34 Ọ bụrụ na onye amụma maọbụ onye nchụaja maọbụ onye ọbụla ọzọ ekwuo sị, ‘Ihe dị otu a bụ ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị,’ aga m ata onye ahụ kwuru okwu ahụ na ndị ezinaụlọ ya ahụhụ.
35 Ihe ndị a bụ ihe unu na-agwarịta onwe unu nʼotu nʼotu. Ọ bụ ihe enyi na-agwa enyi ya, na ihe nwanna na-agwa nwanna Izrel ibe ya. Unu na-asị, ‘Gịnị bụ ọsịsa Onyenwe anyị nyere?’ maọbụ, ‘Gịnị bụ okwu e si nʼọnụ Onyenwe anyị nata?’
36 Kwụsịnụ ịjụgharị ajụjụ banyere ihe Onyenwe anyị kwuru, nʼihi na okwu onye ọbụla nʼime unu kwuru na-aghọrọ onye ahụ ihe si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta. Site nʼụzọ dị otu a unu na-agbanwe ma na-asụgharịkwa okwu Chineke dị ndụ isi, bụ okwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Chineke anyị.
37 Ihe ndị a niile bụ ihe unu na-ajụkarị onye amụma, ‘Gịnị bụ ọsịsa Onyenwe anyị nyere gị? Maọbụ, gịnị ka Onyenwe anyị kwuru?’
38 Ọ bụ ezie na unu na-ekwu sị, ‘Ihe ndị a bụ ozi si nʼaka Onyenwe anyị,’ ma lee ihe Onyenwe anyị na-ekwu: Unu na-ekwu okwu ndị a, ‘Ihe a bụ ozi si nʼaka Onyenwe anyị,’ ọ bụladị mgbe m gwarala unu si unu asịkwala ‘Ihe ndị a bụ ozi nʼaka Onyenwe anyị.’
39 Ya mere, mụ onwe m ga-echezo unu kpamkpam ma sitekwa nʼihu m chụpụ unu na obodo a nke m nyere unu na nna nna unu ha.
40 Aga m eme ka ịta ụta ebighị ebi bịakwasị unu. Aga m etinyekwa unu nʼọnọdụ ihere nke ga-adịgide ruo ebighị ebi, e, ọnọdụ ihere nke a na-agaghị echefu echefu.”