Jeremias 20

IBO

1 Mgbe Pashua nwa Imea, bụ onye nchụaja, ma burukwa onyeisi na-elekọta ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, nụrụ amụma ndị a Jeremaya na-ebu,

2 o nyere iwu ka e tie Jeremaya, bụ onye amụma ihe, kee ya agbụ, tinye ya nʼọnụ ụzọ ama Dị Elu nke Benjamin, nke dị ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

3 Nʼechi ya, mgbe Pashua tọpụrụ ya site nʼagbụ ahụ, Jeremaya sịrị ya, “Onyenwe anyị akpọghị gị Pashua, kama aha gị bụ Mago-Misabib, nke pụtara, Nwoke ihe egwu gbara gburugburu.

4 Nʼihi na nke a ka Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Aga m eme ka ị ghọọrọ onwe gị, ghọọkwara ndị enyi gị niile ihe egwu. Anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ ha mgbe mma agha ndị iro ha ga-egbuda ha. Aga m ararakwa ala Juda niile nyefee ha nʼaka eze Babilọn, onye ga-egbuda ha. Aga m ararakwa ala Juda niile nyefee ha nʼaka eze Babilọn, onye ga-eburu ndị niile bi nʼime ya gaa Babilọn. Ọ ga-egbu ndị fọdụrụ.

5 Aga m enyefe ndị iro ha akụ niile dị nʼobodo, na ihe niile ha rụpụtara, na ihe niile dị oke ọnụahịa, na ngwongwo na akụ niile nke ndị eze Juda. Ha ga-eburu ya dịka ihe a kwatara nʼagha laa Babilọn.

6 Ma gị onwe gị bụ Pashua, na ndị niile bi nʼụlọ gị, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa Babilọn. Nʼebe ahụ ka ị ga-anwụ. Ebe ahụ kwa ka a ga-eli gị, gị na ndị enyi gị ndị a niile ị na-eburu amụma ụgha.’ ”

7 Onyenwe anyị, ị ghọọla m aghụghọ, meekwa m ka m ghọọ onye a ghọgburu nʼaghụghọ.

8 Nʼihi na mgbe ọbụla m meghere ọnụ kwuo okwu, aghaghị m iti mkpu.

9 Ọ bụrụkwa na m ekwuo nʼobi m sị, “Agaghị m ekwute ihe ọbụla metụtara okwu ya maọbụ aha ya ọzọ.”

10 Ana m anụ ọtụtụ akụkọ nzuzo,

11 Ma Onyenwe anyị nọnyeere m dịka dike nʼagha;

12 Ma gị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, gị, onye na-enyocha onye ezi omume,

13 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ!

14 Ihe a bụrụ ọnụ ka ụbọchị ahụ a mụrụ m bụ.

15 Onye a na-abụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ nke wetara nna m akụkọ ọmụmụ m,

16 Ka e meekwa nwoke ahụ ihe Onyenwe anyị mere obodo ndị ahụ

17 Nʼihi na ọ hapụrụ igbu m mgbe m nọ nʼafọ nne m,

18 Nʼihi gịnị ka m ji site nʼafọ nne m pụta

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado