Jeremias 17

IBO

1 “E ji mkpisi igwe gbunye mmehie Juda,

2 Ọ bụladị ụmụ ha na-echeta ebe ịchụ aja ha,

3 Ugwu m, nke dị nʼala ahụ,

4 Ihe nketa ahụ m nyere gị ga-efunarị gị,

5 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,

6 Onye ahụ ga-adị ka osisi na-eto nʼala tọgbọrọ nʼefu.

7 “Ma ngọzị na-adịrị onye ahụ na-atụkwasị Onyenwe anyị obi ya.

8 Onye dị otu a ga-adị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi,

9 Obi mmadụ dị aghụghọ karịa ihe niile,

10 “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-enyocha obi,

11 Dịka ọkwa si ekpokọba akwa ọ na-eyighị,

12 Ocheeze dị ebube, nke e mere ka ọ dị elu site na mmalite,

13 Onyenwe anyị, olileanya Izrel ka ị bụ.

14 Onyenwe anyị, ọ bụrụ na i mee ka ahụ sie m ike aga m adị ndụ.

15 Ha nọ na-ajụ m ọnụ, na-asị m,

16 Ma esitebeghị m na ị bụ onye ọzụzụ atụrụ gị wezuga onwe m.

17 A ghọrọla m ihe na-eyi egwu,

18 Mee ka ihere mee ndị na-akpagbu m.

19 Ihe a ka Onyenwe anyị gwara m, “Gaa, guzo nʼọnụ ụzọ ama obodo, ebe ndị eze Juda na-esi apụ, ma na-abatakwa. Guzokwa nʼọnụ ụzọ ama ndị ọzọ niile dị na Jerusalem.

20 Gwa ha sị, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị eze Juda na ndị Juda niile, na ndị niile bi na Jerusalem, ndị na-esi nʼọnụ ụzọ a apụ, na-abatakwa.’

21 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Lezienụ onwe unu anya ịhụ na unu ebughị ibu ọbụla nʼụbọchị izuike; lezienụ onwe unu anya ịhụ na unu esiteghị nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem bufee ya.

22 Unu esitela nʼụlọ unu buputa ihe ọbụla, unu arụkwala ọrụ ọbụla nʼụbọchị izuike. Doonụ ụbọchị izuike nsọ dịka m nyere nna unu ha nʼiwu.

23 Ma ha egeghị ntị, maọbụ kpọọ ya mkpa ha. Ha bụ ndị ntị ike, ndị na-adịghị aṅa ntị nʼịdọ aka na ntị, maọbụ nabata ya.

24 Ma otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, ọ bụrụ na unu ga-elezi anya rubere m isi, hapụ isi nʼọnụ ụzọ ama obodo a bufee maọbụ bubata ibu nʼụbọchị izuike, kama debe ụbọchị izuike nsọ, site na-arụghị ọrụ ọbụla nʼime ya,

25 mgbe ahụ, ndị eze ndị ga-anọkwasị nʼocheeze Devid ga-edu ndị na-ejere ya ozi na-agafe na-abatakwa site nʼọnụ ụzọ ama a. Ha na ndị na-ejere ha ozi ga-anọkwasị nʼịnyịnya ha, na nʼụgbọ agha ha, mgbe ha sị nʼọnụ ụzọ ama a na-abata, ma na-apụ. Ndị Juda, na ndị bi na Jerusalem ga-esokwa ha nʼazụ. Aga m emekwa ka ndị mmadụ biri nʼobodo a ruo mgbe ebighị ebi.

26 Ndị mmadụ ga-esite nʼobodo niile nke Juda, na nʼobodo nta gbara Jerusalem gburugburu; ha ga-esitekwa nʼala ndị Benjamin, na nʼala ndagwurugwu nke ugwu ndị ahụ dị nʼọdịda anyanwụ, sitekwa nʼala Negev, na-ewebata onyinye aja nsure ọkụ, na aja dị iche iche, na onyinye ọka, na onyinye ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na onyinye ekele, nʼime ụlọ Onyenwe anyị.

27 Ma ọ bụrụ na unu enupu isi jụ idebe ụbọchị izuike nsọ, ọ bụrụ na unu anọgide na-ebubata ihe site nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem nʼụbọchị izuike, aga m amụnye ọnụ ụzọ ama niile dị na Jerusalem ọkụ, nke a na-apụghị imenyụ emenyụ. Ọ ga-erepịakwa ebe niile e wusiri ike na Jerusalem.’ ”

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado