1 Aga m abụ abụ nye onye m hụrụ nʼanya,
2 O gwuzere ya, wepụsịa okwute niile dị nʼime ya,
3 “Ugbu a, ndị ikom Jerusalem na Juda, unu anụla ihe mere.
4 Olee ihe ọzọ m gaara emere ya
5 Ugbu a, lee,
6 Agaghị m akwachakwa ya ọzọ.
7 Ubi vaịnị nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
8 Ahụhụ dịrị unu ndị na-azụkọta ala
9 Ma Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ihe banyere unu, na ọnọdụ unu. Eji m ntị m abụọ nụ mgbe ọ na-asị,
10 Ubi vaịnị ahụ a ga-eji ehi abụọ kọọ ụbọchị iri ga-ewepụta naanị ihe nwere ike iru galọọnụ mmanya isii,
11 Ahụhụ ga-adịrị unu niile ndị na-ebili nʼisi ụtụtụ
12 Unu na-eji ụbọ akwara dị iche iche na une,
13 Nʼihi ya, ndị m ga-eje biri na mba ọzọ,
14 Nʼihi ya, ala mmụọ na-eme ka ọchịchọ ya saa mbara,
15 Nʼụbọchị ahụ, a ga-eweda nʼala ndị dị elu,
16 Ma Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee ọnọdụ dịkarịsịrị elu, nʼihi ikpe ikpe ziri ezi ya,
17 Mgbe ahụ, ụmụ atụrụ ga-akpa nri ha dị ka ọ bụ nʼọzara ka ha nọ,
18 Ahụhụ ga-adịrị ndị ji aghụghọ na-adọkpụgharị mmehie ha;
19 Nye ndị ahụ na-asị “Ka Chineke mee ngwa;
20 Ahụhụ dịrị ndị na-akpọ ihe ọjọọ ezi ihe
21 Ahụhụ ga-adịrị ndị maara ihe nʼanya nke onwe ha,
22 Ahụhụ ga-adịrị ndị bụ dike nʼịṅụ mmanya,
23 ndị na-asị onye ikpe maara nʼikpe amaghị ya nʼihi ịnata ngarị,
24 Nʼihi ya, dịka ire ọkụ si erechapụ ahịhịa ọka,
25 Nʼihi nke a, iwe Onyenwe anyị dị ọkụ megide ndị ya;
26 Ọ ga-eweli ọkọlọtọ nye mba niile dị nʼebe dị anya,
27 Ọ dịghị onye na-ada mba, ọ dịkwaghị onye nʼasụ ngọngọ nʼime ha,
28 Àkụ ha niile dị nkọ,
29 Ha na-ebigbọ dịka ọdụm,
30 Nʼụbọchị ahụ, ha ga-ebigbọ nʼelu ya