1 Ahụhụ ga-adịrị okpueze okoko ọhịa ahụ, nke bụ mpako Ifrem,
2 Lee, Onyenwe anyị nwere otu onye dị ike, onye nwekwara ume,
3 Okpueze okoko osisi, bụ mpako nke ndị Ifrem na-aṅụbiga mmanya oke,
4 Okoko ọhịa nke na-akpọnwụ akpọnwụ, nke bụ ebube ịma mma ya,
5 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nʼonwe ya,
6 Ọ ga-abụ mmụọ nke ikpe ziri ezi
7 Ndị a kwa na-adagharị site na mmanya
8 Nʼihi na tebul ha niile jupụtara nʼihe ọgbụgbọ ruru unyi.
9 “Ọ bụ onye ka ọ na-achọ ikuziri ihe?
10 Nʼihi na ọ na-agbalị izi anyị ihe dịka e si dee ya,
11 Nʼezie, Chineke ga-eji ndị na-asụ asụsụ unu na-amaghị
12 Nʼihi na ọ gwara unu okwu sị,
13 Ọ bụ nʼihi ya ka e ji na-ezi unu okwu Onyenwe anyị
14 Nʼihi nke a, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị na-akwa emo,
15 Nʼihi na unu ekwuola sị, “Anyị na ọnwụ agbaala ndụ,
16 Ma otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị,
17 Ikpe ziri ezi ga-abụ eriri ọtụtụ nke ji atụ ihe,
18 Mgbe ahụ, a ga-akagbu ọgbụgba ndụ ahụ unu na ọnwụ gbara;
19 Mgbe ọbụla o si nʼebe unu nọ na-agafe, ọ ga-eburu unu,
20 Ihe ndina dị mkpụmkpụ, mmadụ enweghị ike esetipụ onwe ya nʼelu ya;
21 Onyenwe anyị ga-ebili dịka o mere nʼugwu Perazim,
22 Ugbu a, ya mere, kwụsịnụ ịkwa emo,
23 Geenụ ntị, nụrụnụ olu m,
24 Ọ bụ ụbọchị niile ka onye ọrụ ubi na-akọ ala ubi ya hapụ ịkụnye ya mkpụrụ?
25 Mgbe o gwuzesịrị ya,
26 Ọ maara ihe o kwesiri ime,
27 Nʼihi na ejighị igwe eji azọcha mkpụrụ ọka etichapụta mkpụrụ karawe,
28 A na-akwọ ọka e ji eme achịcha akwọ,
29 Ihe ndị a niile na-esite nʼaka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-abịa,