1 Nke a bụ amụma megide Ijipt:
2 “Aga m akpali ndị Ijipt mee ka ha lụọ ọgụ nʼetiti onwe ha.
3 Ndị Ijipt ga-ada mba nʼime mmụọ ha,
4 Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ya sị,
5 Mmiri dị nʼosimiri ga-atada;
6 Ụzọ niile osimiri Ijipt ahụ si asọgharị
7 Ahịhịa ndụ niile dị nʼakụkụ Naịl ga-akpọnwụ,
8 Ndị ọkụ azụ ga-asụ ude, kwaa ụwa,
9 Ndị nʼarụ ọrụ flakisi etiri eti ga-eru ụjụ,
10 Obi ụtọ agaghị adịkwara ndị na-esite nʼịkpa akwa enweta ego,
11 Naanị ndị nzuzu ka ndịisi Zoan bụ,
12 Ebee ka ndị ikom gị ahụ maara ihe nọ ugbu a?
13 Ndịisi obodo Zoan aghọọla ndị nzuzu,
14 Onyenwe anyị awụnyela nʼime ha
15 Ọ dịghị ihe Ijipt nwere ike ime,
16 Nʼụbọchị ahụ, ndị ikom Ijipt ga-adị ka ndị inyom, ha ga na-ama jijiji nʼegwu nʼihi aka ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile weliri elu imegide ha.
17 Ala Juda ga-ewetara ndị Ijipt oke egwu, oke ụjọ ga-atụ onye ọbụla akpọtaara aha Juda, nʼihi ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ezube megide ha.
18 Nʼụbọchị ahụ, obodo ise nʼime ala Ijipt ga-asụ asụsụ Kenan, ṅụọ iyi irubere Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile isi. Otu nʼime obodo ndị a ka a ga-akpọ Obodo anwụ.
19 Nʼụbọchị ahụ, ebe ịchụrụ Onyenwe anyị aja ga-adị nʼetiti ala Ijipt. A ga-ewukwa otu ogidi ncheta nye Onyenwe anyị nʼoke ala ha.
20 Nke a ga-abụ ihe ama na ihe ngosi, na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọkwa nʼIjipt. Mgbe ha kpọkuru Onyenwe anyị maka ndị na-emegbu ha, ọ ga-aza ha, ọ ga-ezitere ha onye nzọpụta, onye ga-azọpụta ha.
21 Ya mere, Onyenwe anyị ga-eme ka ndị Ijipt mara onye ọ bụ, nʼụbọchị ahụ, ha ga-amata Onyenwe anyị, jirikwa ịchụ aja na onyinye fee ya. Ha ga-ekwe Onyenwe anyị nkwa debekwa ya.
22 Onyenwe anyị ga-eti Ijipt ihe otiti, ma ọ ga-agwọkwa ha. Ndị Ijipt ga-alọghachikwute Onyenwe anyị, ọ ga-aṅakwa ntị nʼarịrịọ ha gwọọkwa ha.
23 Nʼụbọchị ahụ, a ga-enwe okporoụzọ atụliri atụli nke ga-esite na Ijipt ruo Asịrịa. Ndị Asịrịa ga-aga Ijipt, ndị Ijipt ga-agakwa Asịrịa, ndị Ijipt na ndị Asịrịa ga-eso fee ofufe.
24 Nʼụbọchị ahụ ka Izrel ga-abụ nke atọ imezu Ijipt na Asịrịa, bụrụ ngọzị nʼụwa.
25 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-agọzi ha, na-asị, “Ka ngọzị dịrị Ijipt, ndị m, dịrị Asịrịa nke bụ akaọrụ m, na Izrel ihe nketa nke m.”