Hebreus 1

IBO

1 Na mgbe ochie, Chineke gwara nna nna anyị ha okwu nʼoge dị iche iche site nʼọnụ ndị amụma, na site nʼụzọ ndị ọzọ dị iche iche.

2 Ma nʼoge ikpeazụ ndị a, ọ gwala anyị okwu site nʼọnụ Ọkpara ya, onye o nyefere ihe niile nʼaka. Ọ bụ site nʼaka ya ka o siri kee ụwa niile na ihe dị nʼime ya.

3 Ọ na-enwupụta ebube ya na-anọchitekwa anya ụdịdị ya, ebe o ji okwu ya dị ike na-ejikọta ihe niile. Mgbe ọ sachapụrụ ma hichapụkwa mmehie niile, ọ nọdụrụ nʼaka nri nke Onye dị ukwuu, dị elu nʼeluigwe.

4 Ya mere, ọ bụrụla onye dị ukwu karịa ndị mmụọ ozi dị ka aha e nyere ya si dị elu karịa nke ha.

5 Onye nʼetiti ndị mmụọ ozi ka ọ gwarala sị,

6 Ọzọkwa, mgbe o mere ka nwa mbụ ya bịa nʼụwa, o nyere iwu sị,

7 O kwukwara banyere ndị mmụọ ozi ya, ọ sịrị,

8 Ma banyere Ọkpara ahụ, ọ sịrị,

9 Ị hụrụ ezi omume nʼanya ma kpọọ ihe ọjọọ asị.

10 Ọ sịkwara,

11 Ha ga-ala nʼiyi, ma gị onwe gị ga-anọgide.

12 Ị ga-apịakọta ha,

13 O nweela mmụọ ozi ọbụla ọ sịrị,

14 Ndị mmụọ ozi niile, ha abụghị mmụọ ndị na-ejere Chineke ozi, ndị a na-ezipụ ka ha jee ozi nʼihi ndị ahụ ga-eketa nzọpụta?

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado