Gênesis 49

IBO

1 Mgbe ahụ, Jekọb kpọkọtara ụmụ ya ndị ikom niile nʼotu sị ha, “Zukọọnụ ka m gwa unu ihe ga-adakwasị unu nʼụbọchị dị nʼihu.

2 “Zukọọnụ nụrụ, ụmụ ndị ikom Jekọb

3 “Ruben, ọkpara m ka ị bụ,

4 Onye na-agbanwe agbanwe dịka mmiri dị nʼiyi, ị gaghị abụkwa onye mbụ,

5 “Simiọn na Livayị bụ ụmụnne.

6 Ka obi m ghara isonye nʼizuzu ha,

7 Ihe a bụrụ ọnụ ka iwe ha bụ, nʼihi na ọ dị njọ.

8 “Gị, Juda, ụmụnne gị ga-eto gị.

9 Ị bụ nwa ọdụm, gị, Juda,

10 Mkpanaka eze agaghị esite nʼebe Juda nọ wezuga onwe ya,

11 Ọ ga-ekenye ịnyịnya ibu ya nʼosisi vaịnị,

12 Anya ya ga-acha uhie uhie karịa mmanya vaịnị.

13 “Zebụlọn ga-ebi nʼakụkụ osimiri.

14 “Isaka dị ike dịka ịnyịnya ibu

15 Mgbe ọ hụrụ otu ebe izuike ya si dị mma,

16 “Dan ga-eme ka ikpe ziri ezi rute ndị ya aka

17 Dan ga-adị ka agwọ dị nʼakụkụ okporoụzọ,

18 “O Onyenwe anyị, ana m ele anya nnapụta gị.

19 “Gad bụ onye usuu ndị o-ji-egbe-aga ga-abịakwasị,

20 “Asha ga-esi nʼubi ya wepụta nri gbara abụba,

21 “Naftalị dịka nne ele a hapụrụ ahapụ,

22 “Dịka osisi vaịnị a kụrụ nʼakụkụ iyi,

23 Ndị na-agbata ụta sitere nʼobi ilu lụso ya agha,

24 Ma aka o ji jide ụta nke ya adaghị mba,

25 nʼihi Chineke nna gị, onye na-enyere gị aka,

26 Ngọzị niile nke nna gị, dị ukwu karịa,

27 “Benjamin dịka nkịta ọhịa nke na-adọgbu anụ.

28 Ndị a bụ ebo iri na abụọ dị nʼIzrel. Ihe ndị a bụkwa ihe nna ha gwara ha mgbe ọ gọziri ha, nye onye ọbụla nʼime ha ngọzị nke ruuru ya.

29 Emesịa, o nyere ha ndụmọdụ sị ha, “Nʼoge na-adịghị anya site ugbu a, aga m anwụ. Unu aghaghị ili m nʼebe e liri nna m ha, nʼala Kenan, nʼime ọgba ahụ dị nʼọhịa Efrọn, onye Het.

30 Nʼime ọgba dị nʼọhịa Makipela, nke dị nso na Mamre, nʼala Kenan, ọhịa Ebraham zụtara site nʼaka Efrọn onye Het, maka ili ozu.

31 Nʼebe ahụ ka e liri Ebraham na Sera nwunye ya. Nʼebe ahụ kwa ka e liri Aịzik na Ribeka nwunye ya. Nʼebe ahụ ka m liri Lịa.

32 Ebraham nna nna m zụrụ ala ahụ na ọgba dị nʼime ya site nʼaka ụmụ Het.”

33 Mgbe Jekọb kwuchara okwu ndụmọdụ ikpeazụ ndị a nye ụmụ ya ndị ikom, ọ chịkọtara ụkwụ ya nʼelu akwa, kuo ume ikpeazụ. A chịkọtara ya na ndị ya.

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado