Ezequiel 29

IBO

1 Nʼafọ nke iri, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke iri na abụọ, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

2 “Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼIjipt buo amụma megide Fero bụ eze Ijipt, na ala Ijipt niile.

3 Gwa ya okwu, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị:

4 Ma aga m etinye nko nʼagba gị,

5 Aga m ahapụ gị

6 Mgbe ahụ, ndị niile bi nʼIjipt ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

7 Mgbe ha jidere gị nʼaka, ị nyajiri dọwaa ha ubu ha. Mgbe ha dabeere na gị, ị gbajiri mee ka ha ghara inwekwa ike iguzosi ike nʼụkwụ ha.

8 “ ‘Nʼihi ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Lee, aga m eme ka mma agha bịakwasị gị, aga m ebipụkwa mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime gị.

9 Ala Ijipt ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu; ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

10 Nʼihi ya, aga m edo onwe m megide gị, megidekwa osimiri gị. Aga m ala Ijipt niile nʼiyi site na Migdol ruo Aswan, ruokwa nʼoke ala ha na ndị Kush.

11 Ọ dịghị ụkwụ anụmanụ maọbụ mmadụ ga-agafe nʼime ya, agaghị ebikwa nʼime ya ruo mgbe iri afọ anọ gasịrị.

12 Aga m emekwa ka ala Ijipt bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu nʼetiti mkpọmkpọ ala niile, obodo ya niile ga-atọgbọrọ nʼefu iri afọ anọ nʼetiti obodo ndị e mere ka ha laa nʼiyi. Aga m achụsasị ndị Ijipt nʼetiti mba niile, fesaa ha nʼala niile.

13 “ ‘Ọzọkwa, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, nʼọgwụgwụ iri afọ anọ ahụ, aga m achịkọtakwa ndị Ijipt site nʼebe niile ha gbasara.

14 Aga m emekwa ka ndị ya niile laghachi nʼala Patros, ala ebe a mụrụ ha. Ma Ijipt agaghị abụkwa alaeze a maara nke ọma ọzọ.

15 Ọ ga-abụ alaeze dị nnọọ ala karịa alaeze niile. Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ ọ ga-eweli onwe ya elu karịa mba ọzọ niile. Aga m emekwa ka ha dị nta, nke ha agaghị inwe ike achịkwa mba niile ọzọ.

16 Ijipt agaghị abụkwara ụlọ Izrel ihe ntụkwasị obi, kama ọ ga-abụrụ ha ihe iji cheta mmehie ha mere mgbe ha lere anya enyemaka site nʼaka ya. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụOnyenwe anyị.’ ”

17 Ọ ruo, nʼiri afọ abụọ na asaa, nʼọnwa mbụ, nʼụbọchị nke mbụ, ka okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

18 “Nwa nke mmadụ, Nebukadneza bụ eze Babilọn mere ka ndị agha ya lụsoo Taịa ọgụ nʼebe ọ dị ukwuu. Isi niile ọbụla ka e mere ka ọ kwọchasịa, ubu niile kwa echihịara echihịa. Ma ya na ndị agha ya anataghị ụgwọ ọrụ ọbụla, nʼagha ahụ o buru megide Taịa.

19 Nʼihi nke a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu sị: Lee, ana m aga inye Nebukadneza eze Babilọn ala Ijipt. Ọ ga-akwakọrọ akụnụba ya, ọ ga-azacha ma bukọrọkwa ihe niile nke dị nʼala ahụ. Ha ga-abụkwa ụgwọ ọrụ nke ndị agha ya.

20 Enyefeela m ala Ijipt nʼaka ya, ka ọ bụrụ ụgwọ ọrụ nʼihi ọrụ ya, nʼihi na ya na ndị agha ya rụụrụ m ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.”

21 “Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka otu mpi puputara ụlọ Izrel. Aga m asaghekwa ọnụ gị nʼetiti ha. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado