1 Ijiji nwụrụ anwụ ga-eme ka mmanụ isi ụtọ sie isi ọjọọ.
2 Obi onye maara ihe na-eme ka o mee ihe ziri ezi,
3 Ị ga-ama onye nzuzu site nʼije ụkwụ ya,
4 Ọ bụrụ na iwe onye ọchịchị ebilie megide gị,
5 Ọ dịkwa ihe ọjọọ ọzọ m hụrụ nʼokpuru anyanwụ,
6 Ahụrụ m ka ndị nzuzu na-enweta ọkwa dị elu,
7 Ahụla m ka ohu na-agba ịnyịnya,
8 Onye gwuru olulu ga-adaba nʼime ya!
9 Onye na-arụ ọrụ nʼebe a na-awa nkume ka nkume ga-adakwasị.
10 Ọ bụrụ na anyụike adịghị nkọ,
11 Ọ bụrụ na agwọ ataa mmadụ tupu e kechie ya ọnụ,
12 Okwu onye maara ihe na-ejupụta nʼamara,
13 Nʼihi na mmalite okwu ya bụ nzuzu,
14 Onye nzuzu na-ekwu ọtụtụ okwu.
15 Ọrụ nke ndị nzuzu na-agwụ ya ike,
16 Ahụhụ ga-adịrị ala nke eze ya bụ nwantakịrị,
17 Ngọzị na-adịrị ala ahụ nke eze ya bụ onye a na-asọpụrụ,
18 Ọ bụ umengwụ na-eme ka ụlọ hie mmiri;
19 Ịkpọ oriri na-eweta ọnụ ọchị,
20 Akọchala eze, ọ bụladị nʼechiche obi gị;