Deuteronômio 23

IBO

1 Nwoke ọbụla echipịara mkpụrụ amụ ya, maọbụ nke e bipụrụ mkpụrụ amụ ya, agaghị esonye na mkpọkọta Onyenwe anyị.

2 Nwa ọbụla a mụtara site nʼịkwa iko agakwaghị esonye na mkpọkọta Onyenwe anyị, ụmụ ụmụ ya, ruo nʼọgbọ nke iri, agakwaghị esonye na mkpọkọta Onyenwe anyị.

3 Onye Amọn, maọbụ onye Moab, agaghị esonye na mkpọkọta Onyenwe anyị, ọ bụladị ruo nʼọgbọ nke iri ha.

4 Nʼihi na ha e jighị achịcha na mmiri bịa zute unu nʼụzọ mgbe unu si Ijipt pụta, ha goro Belam, nwa Beoa, onye si Petọ nke dị na Aram Naharaim, ka ọ bụọ unu ọnụ.

5 Ma Onyenwe anyị Chineke gị egeghị Belam ntị, kama Onyenwe anyị Chineke gị gbanwere ịbụ ọnụ ahụ mee ka ọ ghọọrọ gị ngọzị, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị hụrụ gị nʼanya.

6 Achọla udo ndị Amọn na Moab, na ọdịmma ha ụbọchị ndụ gị niile ruo mgbe ebighị ebi.

7 Ma eledala ndị Edọm anya, nʼihi na ndị Edọm bụ ụmụnna unu. Unu eledala ndị Ijipt anya, nʼihi na unu biri dịka ndị ọbịa nʼime ala ha.

8 Ụmụ a ga-amụrụ ha nʼọgbọ nke atọ ha nwere ike ịbata na mkpọkọta nke Onyenwe anyị.

9 Mgbe unu mara ụlọ ikwu unu maka ibu agha megide ndị iro unu, wezuganụ onwe unu site nʼihe ọbụla na-adịghị ọcha.

10 Nwoke ọbụla nʼetiti gị nke na-adịghị ọcha site nʼịnyụ mkpụrụ nwa nʼahụ ya nʼabalị, ga-apụ gaa nọdụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu.

11 Ọ ga-anọ nʼebe ahụ ruo uhuruchi, emesịa, ọ ga-asa ahụ ya lọghachi nʼụlọ ikwu nʼanyasị.

12 Ị ga-enwekwa otu ebe ndị gị ga-anọ jee nʼogwe ga-adị nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu.

13 Onye ọbụla nʼime unu ga-enwe shọvel dịka otu nʼime ngwa agha ya. Mgbe ọbụla kwa o jere nʼogwe, ọ ga-eji ya gwuo ala kpochie nsị ọ nyụrụ.

14 Ụlọ ikwu gị ga-adị nsọ, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị na-ejegharị nʼetiti gị ichebe gị, na ịnapụta gị site nʼaka ndị iro gị. Onyenwe anyị achọghị ihu ihe ọbụla na-adịghị mma nʼanya, ka ọ ghara ịlaghachi azụ iso gị.

15 Ọ bụrụ na ohu esite nʼaka onye nwe ya gbakwute unu, akwagidela ya ka ọ lọghachi,

16 hapụ ya ka o biri nʼetiti gị nʼime obodo ọbụla masịrị ya, emegbukwala ya.

17 Ọ dịghị nwoke maọbụ nwanyị, onye Izrel ga-aghọ akwụna ụlọ arụsị.

18 Ị gaghị ewebata nʼụlọ Onyenwe anyị Chineke gị, onyinye ọbụla site nʼego nwanyị na-agba akwụna kpatara, maọbụ site nʼego nwoke ahụ na-edebe onwe ya dịka akwụna nye ndị ikom ibe ya kpatara, iji mezuo nkwa ọbụla. Nʼihi na ha abụọ bụ ihe rụrụ arụ nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị.

19 A nakwala onye Izrel ibe gị ọmụrụnwa, nʼihe ọbụla i binyere ya, maọbụ ego, maọbụ nri, ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla ọzọ nwere ike ịmụta ọmụrụnwa.

20 Onye mba ọzọ ka ị ga-ana ọmụrụnwa nʼihe i binyere ya, ọ bụghị onye Izrel ibe gị. Ka Onyenwe anyị bụ Chineke gị gọzie gị nʼihe niile i tinyere aka gị ime nʼala ahụ nke ị na-aba inweta.

21 Mgbe i kwere Onyenwe anyị bụ Chineke gị nkwa, alala azụ nʼịkwụghachi ya, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị chọrọ ka ị kwụghachi nkwa gị ọsịịsọ. Ọ ga-abụkwara gị mmehie ma i meghị ya.

22 Ma ọ gaghị abụrụ gị mmehie ma ọ bụrụ na i kweghị nkwa ọbụla!

23 Ihe ọbụla nke i kwere na nkwa, jisie ike hụ na i mezuru nke ahụ dịka okwu gị si dị, nʼihi na ọ bụ onyinye afọ ofufu nye Onyenwe anyị Chineke gị.

24 Ọ bụrụ na ị banye nʼubi vaịnị onye agbataobi gị, i nwere ike ghọrọ mkpụrụ vaịnị ọbụla ị chọrọ rachaa nʼebe ahụ, ma etinyela mkpụrụ ọbụla nʼakpa gị.

25 Otu a kwa, ị banye nʼubi ọka onye agbataobi gị, ghọrọ mkpụrụ ọka ọbụla ị chọrọ nʼaka gị, nọọkwa nʼebe ahụ taa ya, ma ị gaghị etinye mma iwe ihe ubi nʼime ọka ha ndị guzoro eguzo.

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado