Apocalipse 7

IBO

1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m ndị mmụọ ozi anọ ka ha guzo nʼakụkụ anọ nke ụwa. Ha na-egbochikwa ka ifufe ọbụla ghara ife nʼelu ala, na nʼelu osimiri, na nʼelu osisi.

2 Mgbe ahụ, ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka o si nʼọwụwa anyanwụ na-apụta, akara Chineke dị ndụ dịkwa nʼaka ya. O tikuru ndị mmụọ ozi anọ ahụ mkpu, bụ ndị ahụ e nyere ike imekpa ụwa ahụ, ya na oke osimiri,

3 na-asị, “Unu emebila ụwa maọbụ oke osimiri maọbụ osisi ọbụla tutu ruo mgbe anyị kachara ndị ohu niile nke Chineke anyị akara nʼegedege ihu ha.”

4 Mgbe ahụ anụrụ m ọnụọgụgụ ndị a kara akara ahụ, ha dị narị puku mmadụ, na iri puku mmadụ anọ na anọ, bụ ndị sitere nʼebo niile nke Izrel.

5 Ndị a kara akara site nʼebo Juda dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).

6 E sitere nʼebo Asha họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000).

7 Ndị si nʼebo Simiọn dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).

8 E sitere nʼebo Zebụlọn họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000).

9 Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m oke igwe mmadụ, ndị dị ọtụtụ nʼọnụọgụgụ nke onye ọbụla na-apụghị ịgụta ọnụ. Ha sitere na mba dị iche iche na ebo dị iche iche na ndị niile na asụsụ dị iche iche, na-eguzo nʼihu ocheeze ahụ na nʼihu Nwa Atụrụ ahụ. Ha yikwasịrị onwe ha uwe ọcha, jirikwa igu nkwụ nʼaka ha.

10 Ma ha ji oke olu na-eti mkpu na-asị,

11 Ndị mmụọ ozi niile ahụ guzoro ocheeze ahụ gburugburu, ha na ndị okenye ahụ na anụ anọ ahụ dị ndụ. Ha dara, kpuo ihu ha nʼala nʼihu ocheeze ahụ feekwa Chineke ofufe,

12 na-asị,

13 Mgbe ahụ, otu nʼime ndị okenye ahụ zara m sị, “Ị maara ndị ahụ, ndị a e gbokwasịrị uwe ọcha ahụ, ebee ka ha siri pụta?”

14 Asịrị m, “Onyenwe m, ọ bụ gị maara.”

15 Ọ bụ nke a mere,

16 ‘Agụụ agaghị agụkwa ha ọzọ.

17 Nʼihi na Nwa Atụrụ ahụ nke nọ nʼetiti ocheeze ahụ

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado