2 Samuel 22

IBO

1 Devid buuru Onyenwe anyị okwu niile nke abụ a mgbe Onyenwe anyị napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl.

2 Ọ sịrị:

3 Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya.

4 “Akpọkuru m Onyenwe anyị; onye e kwesiri inye otuto.

5 Ebili mmiri nke ọnwụ gbara m gburugburu;

6 Ụdọ niile nke ili kere m agbụ,

7 “Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị,

8 Ụwa mere mkpọtụ maa jijiji,

9 Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta;

10 O kewara mbara eluigwe, rịdata;

11 Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim felie elu,

12 O mere ọchịchịrị ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu,

13 Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya,

14 Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe bigbọọ.

15 Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa.

16 E kpughere ala ala nke oke osimiri.

17 “O sitere nʼelu setịpụ aka ya,

18 Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike,

19 Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m.

20 Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara,

21 “Onyenwe anyị mesoro m dịka ezi omume m si dị,

22 Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke Onyenwe anyị;

23 Iwu ya niile dị nʼihu m,

24 Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya,

25 Onyenwe anyị kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị,

26 “Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi,

27 Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha,

28 Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi,

29 Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, bụ oriọna m,

30 Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ;

31 “Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke;

32 Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị?

33 Ọ bụ Chineke na-enye m ike,

34 Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele

35 Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha,

36 Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m,

37 Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ.

38 “Achụrụ m ndị iro m ọsọ, kpochapụ ha.

39 Etidara m ha nʼala kpamkpam. Ha enwekwaghị ike ibilite.

40 Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha.

41 I meela ka ndị iro m tụgharịa gbalaga.

42 Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha.

43 Egwepịara m ha nke ọma, mee ka ha dịrị ka ntụ nke ala.

44 “Ị napụtala m site nʼaka ndị niile na-alụso m ọgụ.

45 Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu,

46 Obi na-ada ha mba.

47 “Onyenwe anyị na-adị ndụ. Otuto dịrị oke nkume m.

48 Ọ bụ Chineke ahụ, onye na-abọrọ m ọbọ.

49 Onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m.

50 Nʼihi nke a, Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche.

51 “Chineke na-enye eze ya mmeri dị ukwuu.

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado