1 Devid buuru Onyenwe anyị okwu niile nke abụ a mgbe Onyenwe anyị napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl.
2 Ọ sịrị:
3 Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya.
4 “Akpọkuru m Onyenwe anyị; onye e kwesiri inye otuto.
5 Ebili mmiri nke ọnwụ gbara m gburugburu;
6 Ụdọ niile nke ili kere m agbụ,
7 “Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị,
8 Ụwa mere mkpọtụ maa jijiji,
9 Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta;
10 O kewara mbara eluigwe, rịdata;
11 Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim felie elu,
12 O mere ọchịchịrị ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu,
13 Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya,
14 Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe bigbọọ.
15 Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa.
16 E kpughere ala ala nke oke osimiri.
17 “O sitere nʼelu setịpụ aka ya,
18 Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike,
19 Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m.
20 Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara,
21 “Onyenwe anyị mesoro m dịka ezi omume m si dị,
22 Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke Onyenwe anyị;
23 Iwu ya niile dị nʼihu m,
24 Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya,
25 Onyenwe anyị kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị,
26 “Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi,
27 Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha,
28 Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi,
29 Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, bụ oriọna m,
30 Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ;
31 “Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke;
32 Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị?
33 Ọ bụ Chineke na-enye m ike,
34 Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele
35 Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha,
36 Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m,
37 Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ.
38 “Achụrụ m ndị iro m ọsọ, kpochapụ ha.
39 Etidara m ha nʼala kpamkpam. Ha enwekwaghị ike ibilite.
40 Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha.
41 I meela ka ndị iro m tụgharịa gbalaga.
42 Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha.
43 Egwepịara m ha nke ọma, mee ka ha dịrị ka ntụ nke ala.
44 “Ị napụtala m site nʼaka ndị niile na-alụso m ọgụ.
45 Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu,
46 Obi na-ada ha mba.
47 “Onyenwe anyị na-adị ndụ. Otuto dịrị oke nkume m.
48 Ọ bụ Chineke ahụ, onye na-abọrọ m ọbọ.
49 Onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m.
50 Nʼihi nke a, Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche.
51 “Chineke na-enye eze ya mmeri dị ukwuu.